Native Bible

Proverbs 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.

Proverbs 7:19 in English

Proverbs 7:19 · Berean Standard Bible

For my husband is not at home; he has gone on a long journey.

Context

17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. 18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. 19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. 20O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” 21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.