Native Bible

Proverbs 7:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”

Proverbs 7:20 in English

Proverbs 7:20 · Berean Standard Bible

He took with him a bag of money and will not return till the moon is full.”

Context

18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. 19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. 20O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” 21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. 22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele* nke na-aba nʼọnya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.