Native Bible

Proverbs 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele* nke na-aba nʼọnya,

Proverbs 7:22 in English

Proverbs 7:22 · Berean Standard Bible

He follows her on impulse, like an ox going to the slaughter, like a deer bounding into a trap,*

Context

20O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” 21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. 22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele* nke na-aba nʼọnya, 23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya. 24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.