Native Bible

Proverbs 7:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.

Proverbs 7:23 in English

Proverbs 7:23 · Berean Standard Bible

until an arrow pierces his liver, like a bird darting into a snare— not knowing it will cost him his life.

Context

21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. 22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele* nke na-aba nʼọnya, 23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya. 24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu. 25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.