Native Bible

Proverbs 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.

Proverbs 7:18 in English

Proverbs 7:18 · Berean Standard Bible

Come, let us take our fill of love till morning. Let us delight in loving caresses!

Context

16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. 17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. 18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. 19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. 20O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.