Native Bible

Proverbs 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.

Proverbs 7:16 in English

Proverbs 7:16 · Berean Standard Bible

I have decked my bed with coverings, with colored linen from Egypt.

Context

14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, 15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa. 16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. 17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. 18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.