Ilu 6:24
Proverbs 6:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
Proverbs 6:24 in English
Proverbs 6:24 · Berean Standard Bible
to keep you from the evil woman, from the smooth tongue of the adulteress.*
Context
22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. 23Nʼihi na iwu a bụ oriọna,*
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,*
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba
bụ ụzọ ezi ndụ, 24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,
sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. 25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,
ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. 26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,
ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.