Ilu 6:26
Proverbs 6:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
Proverbs 6:26 in English
Proverbs 6:26 · Berean Standard Bible
For the levy of the prostitute is poverty,* and the adulteress preys upon your very life.
Context
24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,
sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. 25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,
ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. 26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,
ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. 27Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,
ma uwe ya ereghị ọkụ? 28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ
ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.