Native Bible

Proverbs 6:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.

Proverbs 6:22 in English

Proverbs 6:22 · Berean Standard Bible

When you walk, they will guide you; when you lie down, they will watch over you; when you awake, they will speak to you.

Context

20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.* 21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha. 22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. 23Nʼihi na iwu a bụ oriọna,* Ihe ozizi a bụkwa ìhè,* otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ, 24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.