Native Bible

Proverbs 4:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.

Proverbs 4:18 in English

Proverbs 4:18 · Berean Standard Bible

The path of the righteous is like the first gleam of dawn, shining brighter and brighter until midday.

Context

16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya. 17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara. 18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị. 19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ. 20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.