Ilu 31:24
Proverbs 31:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
Proverbs 31:24 in English
Proverbs 31:24 · Berean Standard Bible
She makes linen garments and sells them; she delivers sashes to the merchants.
Context
22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,
ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo* dụọ. 23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo*
ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ. 24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,
ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ. 25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu. 26Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu
ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.