Native Bible

Proverbs 31:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo* ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.

Proverbs 31:23 in English

Proverbs 31:23 · Berean Standard Bible

Her husband is known at the city gate, where he sits among the elders of the land.

Context

21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi. 22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo* dụọ. 23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo* ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ. 24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ. 25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.