Native Bible

Proverbs 31:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo* dụọ.

Proverbs 31:22 in English

Proverbs 31:22 · Berean Standard Bible

She makes coverings for her bed; her clothing is fine linen and purple.

Context

20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka. 21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi. 22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo* dụọ. 23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo* ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ. 24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.