Ilu 31:20
Proverbs 31:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
Proverbs 31:20 in English
Proverbs 31:20 · Berean Standard Bible
She opens her arms to the poor and reaches out her hands to the needy.
Context
18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;
ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị. 19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;
mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike. 20Ọ na-agbasapụ aka
inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka. 21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche
nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi. 22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,
ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo* dụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.