Ilu 31:18
Proverbs 31:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
Proverbs 31:18 in English
Proverbs 31:18 · Berean Standard Bible
She sees that her gain is good, and her lamp is not extinguished at night.
Context
16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.
Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị. 17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.
Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche. 18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;
ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị. 19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;
mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike. 20Ọ na-agbasapụ aka
inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.