Native Bible

Proverbs 31:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.

Proverbs 31:19 in English

Proverbs 31:19 · Berean Standard Bible

She stretches out her hands to the distaff and grasps the spindle with her fingers.

Context

17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche. 18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị. 19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike. 20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka. 21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.