Native Bible

Proverbs 31:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.

Proverbs 31:16 in English

Proverbs 31:16 · Berean Standard Bible

She appraises a field and buys it; from her earnings she plants a vineyard.

Context

14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri. 15Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha. 16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị. 17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche. 18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.