Ilu 31:15
Proverbs 31:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
Proverbs 31:15 in English
Proverbs 31:15 · Berean Standard Bible
She rises while it is still night to provide food for her household and portions for her maidservants.
Context
13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi
jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ. 14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya
dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri. 15Tupu chi abọzie,
nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,
ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha. 16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.
Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị. 17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.
Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.