Ilu 30:28
Proverbs 30:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
Proverbs 30:28 in English
Proverbs 30:28 · Berean Standard Bible
and the lizard can be caught in one’s hands, yet it is found in the palaces of kings.
Context
26Ewi nkume* bụ ndị na-adịghị ike,
ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume. 27Igurube enweghị eze,
ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị. 28Ngwere dị mfe iji aka jide ya,
ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze. 29“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube,
mbaa, ha dị anọ: 30Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.