Native Bible

Proverbs 3:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.*

Proverbs 3:27 in English

Proverbs 3:27 · Berean Standard Bible

Do not withhold good from the deserving * when it is within your power to act.

Context

25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. 26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị. 27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.* 28A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. 29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.