Ilu 3:28
Proverbs 3:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
Proverbs 3:28 in English
Proverbs 3:28 · Berean Standard Bible
Do not tell your neighbor, “Come back tomorrow and I will provide”— when you already have the means.
Context
26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị,
ọ ga-echebekwa gị. 27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ
mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.* 28A sịkwala onye agbataobi gị laa,
bịaghachi azụ echi
mgbe i nwere ike ime ya taa. 29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị,
nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. 30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi,
mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.