Ilu 27:7
Proverbs 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
Proverbs 27:7 in English
Proverbs 27:7 · Berean Standard Bible
The soul that is full loathes honey, but to a hungry soul, any bitter thing is sweet.
Context
5Mba abara nʼihe ka mma
karịa ịhụnanya ezoro ezo. 6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ,
ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa. 7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ;
ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu. 8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya
dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya. 9Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa,
otu a ka ụtọ enyi dị,
site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.