Ilu 27:6
Proverbs 27:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
Proverbs 27:6 in English
Proverbs 27:6 · Berean Standard Bible
The wounds of a friend are faithful, but the kisses of an enemy are deceitful.
Context
4Iwe na-emebi ihe,
ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe. 5Mba abara nʼihe ka mma
karịa ịhụnanya ezoro ezo. 6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ,
ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa. 7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ;
ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu. 8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya
dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.