Native Bible

Proverbs 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.

Proverbs 27:5 in English

Proverbs 27:5 · Berean Standard Bible

Better an open rebuke than love that is concealed.

Context

3Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ. 4Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe. 5Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo. 6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa. 7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.