Native Bible

Proverbs 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.

Proverbs 27:8 in English

Proverbs 27:8 · Berean Standard Bible

Like a bird that strays from its nest is a man who wanders from his home.

Context

6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa. 7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu. 8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya. 9Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha. 10Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.