Ilu 27:9
Proverbs 27:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
Proverbs 27:9 in English
Proverbs 27:9 · Berean Standard Bible
Oil and incense bring joy to the heart, and the sweetness of a friend is counsel to the soul.
Context
7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ;
ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu. 8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya
dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya. 9Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa,
otu a ka ụtọ enyi dị,
site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha. 10Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị.
Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka.
Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya. 11Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe!
Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.