Native Bible

Proverbs 26:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.

Proverbs 26:14 in English

Proverbs 26:14 · Berean Standard Bible

As a door turns on its hinges, so the slacker turns on his bed.

Context

12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a. 13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!” 14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya. 15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri* ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya. 16Nʼuche ya, onye umengwụ* na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.