Ilu 26:15
Proverbs 26:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri* ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
Proverbs 26:15 in English
Proverbs 26:15 · Berean Standard Bible
The slacker buries his hand in the dish; it wearies him to bring it back to his mouth.
Context
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,
ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!” 14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,
otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya. 15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri*
ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya. 16Nʼuche ya, onye umengwụ* na-eche na ọ maara ihe
karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu. 17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya
dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.