Ilu 26:12
Proverbs 26:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
Proverbs 26:12 in English
Proverbs 26:12 · Berean Standard Bible
Do you see a man who is wise in his own eyes? There is more hope for a fool than for him.
Context
10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,
otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya. 11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,
otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha. 12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?
Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a. 13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,
ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!” 14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,
otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.