Ilu 26:11
Proverbs 26:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
Proverbs 26:11 in English
Proverbs 26:11 · Berean Standard Bible
As a dog returns to its vomit,* so a fool repeats his folly.
Context
9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke
otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu. 10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,
otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya. 11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,
otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha. 12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?
Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a. 13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,
ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.