Native Bible

Proverbs 26:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.

Proverbs 26:10 in English

Proverbs 26:10 · Berean Standard Bible

Like an archer who wounds at random is he who hires a fool or passerby.

Context

8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ. 9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu. 10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya. 11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha. 12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.