Ilu 26:9
Proverbs 26:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
Proverbs 26:9 in English
Proverbs 26:9 · Berean Standard Bible
Like a thorn that falls into the hand of a drunkard is a proverb in the mouth of a fool.
Context
7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,
otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta. 8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.
Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ. 9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke
otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu. 10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,
otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya. 11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,
otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.