Ilu 25:15
Proverbs 25:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
Proverbs 25:15 in English
Proverbs 25:15 · Berean Standard Bible
Through patience a ruler can be persuaded, and a gentle tongue can break a bone.
Context
13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,
dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ
nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi. 14Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere
dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri. 15Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,
nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ. 16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?
Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa. 17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,
ka ị ghara ire ugwu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.