Ilu 25:14
Proverbs 25:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
Proverbs 25:14 in English
Proverbs 25:14 · Berean Standard Bible
Like clouds and wind without rain is the man who boasts of gifts never given.
Context
12Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma
ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya. 13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,
dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ
nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi. 14Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere
dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri. 15Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,
nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ. 16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?
Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.