Native Bible

Proverbs 25:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.

Proverbs 25:17 in English

Proverbs 25:17 · Berean Standard Bible

Seldom set foot in your neighbor’s house, lest he grow weary and hate you.

Context

15Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ. 16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa. 17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị. 18Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.* 19Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.