Native Bible

Proverbs 25:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.

Proverbs 25:19 in English

Proverbs 25:19 · Berean Standard Bible

Like a broken tooth or a foot out of joint is confidence in a faithless man in time of trouble.

Context

17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị. 18Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.* 19Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ. 20Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị. 21Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.