Ilu 25:21
Proverbs 25:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.*
Proverbs 25:21 in English
Proverbs 25:21 · Berean Standard Bible
If your enemy is hungry, give him food to eat, and if he is thirsty, give him water to drink.
Context
19Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,
maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ. 20Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,
maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,
otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị. 21Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.* 22Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,
Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị. 23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,
otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.