Ilu 25:23
Proverbs 25:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
Proverbs 25:23 in English
Proverbs 25:23 · Berean Standard Bible
As the north wind brings forth rain, so a backbiting tongue brings angry looks.
Context
21Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.* 22Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,
Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị. 23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,
otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe. 24Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ
karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 25Oziọma e sitere na mba dị anya nata
dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.