Native Bible

Proverbs 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.

Proverbs 23:6 in English

Proverbs 23:6 · Berean Standard Bible

Do not eat the bread of a stingy man,* and do not crave his delicacies;

Context

4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.* 5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo. 6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ. 7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ. 8Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.