Ilu 23:7
Proverbs 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
Proverbs 23:7 in English
Proverbs 23:7 · Berean Standard Bible
for he is keeping track, inwardly counting the cost.* “Eat and drink,” he says to you, but his heart is not with you.
Context
5Nʼihi na akụ nwere ike ifu
nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị
na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo. 6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị.
Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ. 7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ
na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị.
Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,”
ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ. 8Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri
mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu. 9Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu,
nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.