Native Bible

Proverbs 23:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.

Proverbs 23:5 in English

Proverbs 23:5 · Berean Standard Bible

When you glance at wealth, it disappears, for it makes wings for itself and flies like an eagle to the sky.

Context

3Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ. 4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.* 5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo. 6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ. 7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.