Native Bible

Proverbs 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.

Proverbs 23:3 in English

Proverbs 23:3 · Berean Standard Bible

Do not crave his delicacies, for that food is deceptive.

Context

1Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe* dị nʼihu gị anya, 2tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ. 3Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ. 4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.* 5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.