Native Bible

Proverbs 23:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.

Proverbs 23:9 in English

Proverbs 23:9 · Berean Standard Bible

Do not speak to a fool, for he will despise the wisdom of your words.

Context

7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ. 8Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu. 9Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya. 10Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga, 11nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.