Native Bible

Proverbs 23:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.

Proverbs 23:27 in English

Proverbs 23:27 · Berean Standard Bible

For a prostitute is a deep pit, and an adulteress * is a narrow well.

Context

25Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa. 26Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ. 27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara. 28Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke. 29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.