Ilu 23:29
Proverbs 23:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
Proverbs 23:29 in English
Proverbs 23:29 · Berean Standard Bible
Who has woe? Who has sorrow? Who has contentions? Who has complaints? Who has needless wounds? Who has bloodshot eyes?
Context
27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi,
nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara. 28Dịka onye ohi ka ọ na-echere
na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke. 29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ?
Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa?
Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara? 30Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya,
onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa. 31Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara,
mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko
mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.