Ilu 13:22
Proverbs 13:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
Proverbs 13:22 in English
Proverbs 13:22 · Berean Standard Bible
A good man leaves an inheritance to his children’s children, but the sinner’s wealth is passed to the righteous.
Context
20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,
nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu. 21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,
ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume. 22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,
ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume. 23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,
ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya. 24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.