Native Bible

Proverbs 13:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.

Proverbs 13:23 in English

Proverbs 13:23 · Berean Standard Bible

Abundant food is in the fallow ground of the poor, but without justice it is swept away.

Context

21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume. 22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume. 23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya. 24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike. 25Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume. 13:3 Abụ 141:3; Ilu 21:23

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.