Ilu 13:20
Proverbs 13:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
Proverbs 13:20 in English
Proverbs 13:20 · Berean Standard Bible
He who walks with the wise will become wise, but the companion of fools will be destroyed.
Context
18Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;
ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ. 19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,
ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị. 20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,
nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu. 21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,
ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume. 22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,
ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.