Native Bible

Proverbs 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.

Proverbs 1:20 in English

Proverbs 1:20 · Berean Standard Bible

Wisdom calls out in the street, she lifts her voice in the square;

Context

18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide. 19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ. 20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama. 21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile. 22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.