Ilu 1:21
Proverbs 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
Proverbs 1:21 in English
Proverbs 1:21 · Berean Standard Bible
in the main concourse * she cries aloud, at the city gates she makes her speech:
Context
19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.
Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ. 20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
Olu ya na-ada ụda nʼama. 21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile. 22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?
Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị? 23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.